Ónyé ǹdú (1/3)

– Ụmụnnam na ndị enyim, a nuwom ihe niile unu kwụrụ, ya mere m ji a sị unu gee m ntị. Ihe niile na mkparịta ụka niile anyị kwụrụ, onweghị nke zụrụ oke ma anyị nogidisie ike n’ala nadịghị ámị̀ mkpụrụ. N’ala ájá mkpụrụ na okwute ọ dịghị ihe ọ bụla na-epu na ya, na agbanyeghị mgbe mmiri na-ezo, na agbanyeghị oge mmiri niile mịkọsịrị nke onye ọ bụla na ahutubeghi. Rue ole mgbe ka anyị ga ezukọtakwa ọnụ otua nwee mkparịta n’efu? Igwe ehi n’anwu, oge na adịghị anya agụụ ga-ebido gụba anyị na ụmụ anyị. Anyị ga achọtarịrị otu ọ̀zọ́ dị mma, ga aba uru. A nam eche na anyị ga arapụ ala a na-adịghị eme ihe ga n’uwa chọta ala dị mma nke ga eme ka mkpụrụ mịe, n’ihi na anyị agaghị anogịde otu a.
Ya mere, onye bi ebe ala na dịghị eme nri kwuru okwu otu mgbe na ike ọgwụgwụ na ọgbakọ ụfọdụ. Ebe ma ọbu mgbe ọ mere, ọ gbasaghị mụ na gị, a nam eche. Ọ dị mkpa na Ịgba ga ekwenyere m na ihe mere n’ala ụfọdụ n’oge gara aga, ya bụ na nke a ezuwo. N’otu oge na ekwu eziokwu, echerem na ọ bụ mụ bụ ihe mebere akụkọ a, e jim nwayọ nwayọ nwepu onwem na akụkọ a na abeghị uru. Ekweghịm ike ugbu na aga m akọwaputasị ihe mere na nke mere ebe ọ̀zọ́ na otu oge gara aga, ihe na enweghị ike ịkọwaputa.
Ndi na-egentị, jị ike ọgwụgwụ na gbarụ iru na enweghị olileanya, gbanyere aka n’ukwu, na olileanya dị n’okwu amamihe a. Onye ọ bụla nọworị na-eche n’echiche na ọ nọ n’ụdị anwansi, ala paradaịs ebe ụgwọ ọrụ nke ịla azụ ga-abụ nnukwu ihe ubi.
– Ọ kwuru eziokwu! Ọ kwuru eziokwu! – ọtamuru na akụkụ niile.
– Ebe ọ dị ns…o…? – a nụrụ ntamu na-adọkpụ site n’akụkụ.
– Ụmụnam!, – ọ̀zọ́ malịtere n’olu dị ike. – Anyị ga eso ndụmọdụ ozigbo, n’ihi na anyị ama sị otu a ga ọ̀zọ́. Anyị adọgbuola onwe anyị n’ọrụ na setikwa onwe anyị, mana ihe niile bụ ihe efu. Anyị ekola mkpụrụ anyi kwesịrị ejiri mere nri, ma idei mmiri bịara wee sacha mkpụrụ na ala site na mkpọda nke mere na ọ bụ nanị nkume efu fọdụrụ. Anyị a ga anogịde ebe ruo mgbe ebighi ebi na-arụ ọrụ, ụtụtụ na abali na inogide na agụụ na akpịrị ịkpo nkụ, ị́gbá ọ̀tọ́ na ị́gbá ụkwụ ọ̀tọ́? Anyị na ebili ịpụta ka anyi chọọ ebe ka mma na ala na eme nri ebe ịrụsi ọrụ ike ga amịpụta ọtụtụ mkpụrụ.
– Anyị apụọ! Ka anyị pụọ ugbu a, n’ihi na ebe adịghị mma obibi ọ̀zọ́!
Ntamu malịtere, onye ọbụla malịtere ịpụrụ onwe ya, na echeghị ebe ọ n’aga. Agbasịghị ike, anyị nwe ike ijedebe ebe ka njọ karịa ịzọpụta onwe anyị. A nam atunye aro ka anyị rọpụta onye ndu, nke anyị ga erubere isi, onye ga ezi anyị ihe ka mma na ụzọ kwuọtọ.
– Ka anyị ghọta! Ka anyi ghọta mmadu ugbu a, – nke anuru ebe niile.
Nanị ugbu a ka ndọrọ ndọrọ malịtere, ezigbo ọgba aghara.
Onye ọ bụla na ekwu okwu ma onweghị onye nwe ike ịgentị ma ọbu ịnụ ihe. Ha malịte ịkọwa onwe ha n’otu dị iche iche, ọ bụla na-ekwuru onwe ya, mgbe ahụ ọbuna otu otu ahụ kebiwe onwe ha. Na abụọ abụọ, ha malịtere ịkwu okwu site na ogwe aka, na-akparịta ụka, na-anwa igosipụta ihe, na-adọta ibe ha site na aka uwe, ma jiri aka ha na-agbachi nkịtị. Ha zukọtara ọnụ ọ̀zọ́, ma na ekwu kwa okwu.
– Ụmụnam! – otu olu dara ụda tiri mkpu na oke olu, nke mere na ọ mechiri olu ndị ọ̀zọ́ na enweghị ume. – Anyị agaghị ekwete otu ihe otu a. Onye ọ bụla na ekwu okwu, ma onweghị onye na egentị. Ka anyị ghọta onye ndu! Onye n’ime anyị ka anyị ga aghọta? Onye n’ime anyị ga goro njem nke oma, ị mata ụzọ? Anyị mara onwe anyị ọfụma, ya mere mụ onwem agaghị etinye onwe m ma ọbu ụmụ na okpuru ọchịchị onye ọbụla nọ ebe a. Kama, gwam onye njem ahụ nnọọ ebe ahụ, nke nnọri na ndo na okporo ụzọ kemgbe ụtụtụ?
Dara jụụ. Ha niile tụgharịrị n’ebe onye ọbịa nọ, nwe tule ya bido n’isi ruo n’mkpịsị ụkwụ.
Onye njem, agbata nwata na okenye, nwere ihu na-adịghị ahụkebe nke a na-adịghị ahụkebe n’ihi ajị agba ya na ogologo ntutu isi ya, nọdụ ala wee nọrọ jụụ dị ka ọ dị na mbụ, tinye uche n’echiche, wee kụọ nnukwu okpiri ya n’ala site n’oge ruo n’oge.
Ụnyaahụ, a hurum nwoke ahụ na obele nwakorobia. Ha jidere onwe ha n’aka nwee na-agbada n’ogbe. Na abali gara aga, nwata nwoke hapụrụ ogbe ahụ mana onye ọbịa nọ ebe a.
Nwa nna,ka anyị chefuo ihe nzuzu ndị a ka anyị ghara igbu oge ọ bụla. Onye ọ bụla ọ bụ, o si ebe dị anya bịa ebe ọ bụ na ọ nweghị onye n’ime anyị maara ya, ọ makwa n’ezie ụzọ kacha mkpụmkpụ na ụzọ kacha mma isi duru anyị. Ọ bụ ikpe na ọ bụ onye mara ihe, maka ọ nọ ebe ahụ nwayọ na echekwa echiche. Onye ọ bụla ọzọ ga-etinyeworị ihe omume anyị ugboro iri ma ọ bụ karịa ka ọ dị ugbu a ma ọ bụ malịte mkparịta ụka na otu n’ime anyị, kama ọ na anogịde ebe ahụ oge niile na onwe ya na akwụghị ihe ọbụla.
– N’ezie, nwoke a n’ano nwayọ maka na ọ nwere ihe ọ na-eche, ọ nwere ike ị bụ ihe ọzọ beluso na o maara oke ihe, – Ndi ọzọ kwetere, nwe malịte inyocha onye obia ọzọ. Onye ọbụla achoputawo ihe amamihe dị n’ime ya, ngosi ihe pụtara na amamihe ya.
Na egbughị ọtụtụ oge na ekwu okwu, na ikpeazu ha niile kwenyere na o ga aka mma ka ajuo onye ọbịa a.
Onye, ọ dị ha ka Chineke zitere ka o duputa n’ime uwa ka ha chọọ ogige na ala na eme ihe. Ọ ga abụ onye ndu ha, ma ha ga ege ya ntị na erubere ya isi na abụghị ajụjụ.
Ha ghọtara mmadụ iri n’ime onwe, ndị ga-ejekwuru onye ọbịa kowara ya ihe ha kpebiri. Nroputa a bu e jị ngosi ajọ ọnọdụ ha ma rio ya ka ọ bụrụ onye ndu ha.
Ya mere mmadu iri ahụ nwe ga kpọ isi ala n’obi ume ala. Otu onye n’ime ha, malịtere kwube maka ala na adịghị emeputa ihe, maka aro kpọrọ nkụ na kwa ihe ọjọọ nke ha niile hutara onwe ha n’ime ya. Ọ kwụsịrị na usoro ndị a:
– Ọnọdụ ndị a mere ka anyị hapụ ụlọ anyị na ala anyị nwe pụọ n’ime ụwa ka anyị chọta ala ụlọ ebe ka mma. N’oge a, mgbe anyị mmesia kwekorita, o dizia ka Chineke nwere ebere na-ebe anyị nọ, na ọ zitere anyị gị – gị, onye amamihe na onye ọbịa ziri ezi. Na ị ga edu anyị ma napụta ya na nhusianya anyi. N’aha ndị niile bi n’ebe a, anyị riorio ka ị bụrụ onye ndu anyị. Ebe ọ bụla ị ga aga, anyị ga-eso. Ị mara ụzọ niile, n’ezie amuyere gị n’ọṅụ na ala ụlọ dị mma. Anyị ga-ege gị ntị, rube isi na iwu gị ọ bụla. Ị ga, onye ọbịa mara ihe ekwe ka ịzọputa ọtụtụ mkpụrụ obi na mbibi? Ị ga abu onye ndu anyị?
N’oge niile ọ na-ekwu okwu a, onye bịara abịa maara ihe anaghị ebuli isi ya elu. Oge niile ọ nọ na otu ọnọdụ ha hụrụ ya, ọ nwe dara isi ya, ọ gbaroro ịhụ ma ọ kwughi ihe ọbụla. Soo ihe ọ mere bu iku osisi ya n’ala n’oge niile-na eche. Mgbe e kwụsịrị okwu, ọ na -atụgharị nwayọ nwayọ na-agbanweghị ọnọdụ ya:
– Ekwem!
– Anyị aga eso gị ga chọta ebe ka mma?
– Ị nwere ike! – ọ malitekwa na enweliteghi isi elu. Mmalite ịnụ ọkụ n’obi na ngosipụta nke ekele bilitere ugbu a, mana onye ọbịa agwaghị onye ọ bụla okwu.
Mmadu iri ahụ gwara ndị ọzọ gbakoro ihe ha jetara, ha tinyere na ugbua ka ọ hutara ihe oke amamihe nwoke a nwere.
Ọ meghirighi arụ ma ọ bu nweligodi isi ị hụ onye na-agwa okwu, ọnọdụ nwayọ na etughari uche. N’okwu anyị niile na ekele, ọ kwuru nanị mkpuru okwu anọ.
– Ezi onye amamihe! Ọgugu isi dị uko!
– Ha jị ọṅụ tie oke mkpu na akụkụ niile, na ekwunye na Chineke na onwe ya zitere ya dịka muo ozi si n’eluigwe bịa ịzọputa ya.
Ha niile kwenyesiri ike na oganiru ha na okpuru onye ndu a, nke ọ na enweghi ihe n’ụwa ga gbagoju anya. Na otu aka ahụ, ha kpebiri ka ha belie echi mgbe chi boro.