Ónyé ǹdú (3/3)

Otu a ka ụbọchị mbụ gafere, ụbọchị ndị ọzọ sokwa ya nwee otu ihe ịga nke ọma. Ọ dịghị ihe dị oke mkpa mere, ọ bụ naanị ihe ndị na-enweghị isi: ha na-adaba isi na mbụ n’ime olulu, wee banye n’ime olulu mmiri; ha na-agbagharị megide ogige na ohia ogwu; ha zọkwasịrị ụkwụ n’ọhịa ogwu; ọtụtụ gbajiri aka na ụkwụ; ụfọdụ nwere akpu n’isi. Ma ahụhụ niile a diri. A hapụrụ ụfọdụ ndị agadi ka ha tọgbọ n’ụzọ n’anwu. “Ha gaara anwụ ọbụna ma a sị na ha nọrọ n’ụlọ, ghara ikwu n’ụzọ!” ndị ọnụ na-ekwuchitere kwuru, na-agba ndị ọzọ ume ka ha gaa n’ihu. Obere ụmụaka ole na ole, otu afọ ruo afọ abụọ, lakwara n’iyi. Ndị nne na nna kwụsịrị obi mgbu ha n’ihi na ọ bụ uche Chineke. “Na obere ụmụaka, obere iru uju. Mgbe ha dị obere, iru uju na-adị obere. Chineke nyere ndị nne na nna aka ka ha haghi etufu ụmụ ha ma ọlị mgbe ha ruru afọ ịlụ nwanyị. Ọ bụrụ na ụmụaka ahụ kara aka, ọ ka mma na ha anwụọ n’oge. Mgbe ahụ, iru uju adịghị oke ukwuu!” ndị ọnụ na-ekwuchitere ha kasiri ha obi ọzọ. Ụfọdụ ákwà fụchiri afụ n’isi ha na-etinye ntụpọ oyi n’ahụ nsị ha. Ndị ọzọ na-eburu ogwe aka ha na èbè. A na-egbutu ha niile ma bechapụ ha. Uwe ha kwụwara, mana agbanyeghị na ha ji ọganiihu gaa n’ihu. Ihe a niile gaara adị mfe ịnagide ya ma ọ bụrụ na agụụ agụghị ha ọtụtụ ugboro. Ma ha aghaghị ịnọgide na-aga.
Otu ụbọchị, ihe ka mkpa mere.
Onye ndu na-aga n’ihu, ndị nwoke nwere obi ike nọ n’ime ya gbara ya gburugburu. (Abụọ n’ime ha na-efu, ọ nweghịkwa onye maara ebe ha nọ. Ọ bụ echiche ndị mmadụ n’ozuzu ha na ha raara ụzọ ha wee gbalaga. N’otu oge, onye na-ekwuchitere ọnụ kwuru ihe banyere nghọgbu ha na-eme ihere. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole kwenyere na ha abụọ anwụọla n’ụzọ, mana ha ekwupụtaghị echiche ha ka ha ghara ịkpali ndị ọzọ.) Ndị otu ndị ọzọ nọ n’ahịrị n’azụ ha. Na mberede, ọmarịcha nnukwu ogbu mmiri pụtara – ezigbo abis. Mkpọda ya dị oke elu nke na ha agaghị anwa anwa were nzọụkwụ n’ihu. Ọbụnadị ndị nwere obi ike kwụsịrị obere wee lee onye ndu ahụ anya. N’ịhụ ihu, na-echegbubiga onwe ya ókè, o ji nkwuwa gaa n’ihu, na-akụ okpete ya n’ihu, buru ụzọ gaa n’aka nri, mesịa gaa n’aka ekpe, n’ụzọ e ji mara ya. Ọtụtụ kwuru na ihe a niile mere ka o yie ka ọ kwanyeere ugwu ugwu. Ọ hụghị onye ọ bụla ma ọ bụ kwuo ihe ọ bụla. N’iru ya ọ nweghị mgbanwe ngosipụta ma ọ bụ ihe egwu ọ bụla ka ọ na-abịaru nso na nsọtụ. Ọbụnadị ndị nwere obi ike ghọrọ ihe na-achaghị acha ka ọnwụ, mana onweghị onye ọ bụla nwara ịdọ aka ná ntị onye ndu dị ike, maara ihe. Nzọụkwụ abụọ ọzọ ọ nọ na nsọtụ. N’egwu na-enweghị isi na anya mepere emepe, ha niile mara jijiji.
Ndị nwoke nwere obi ike nọ na njedebe ijide onye ndu ahụ, ọbụlagodi na ọ pụtara mmebi nke ịdọ aka ná ntị, mgbe ọ zọruru otu ugboro, ugboro abụọ, wee mikpuo na ndagwurugwu. E nwere mgbagwoju anya, ịkwa ákwá, iti mkpu; egwu meriri. Ụfọdụ malitere ịgbalaga.
– Jidesie ya ike, ụmụnna m! Kedu ihe na-eme ọsọ ọsọ? Ọ bụ otu a ka ị si edobe okwu gị? Anyị ga-eso nwoke a maara ihe n’ihi na ọ ma ihe ọ na-eme. Ọ ga-abụ onye ara iji mebie onwe ya. Gaa n’ihu, n’azụ ya! Nke a bụ nnukwu na ikekwe ihe egwu ikpeazụ, ihe mgbochi ikpeazụ. Onye ma? Ma eleghị anya, n’akụkụ nke ọzọ nke ndagwurugwu a, anyị ga-ahụ ọmarịcha ala na-eme nri nke Chineke zubere maka anyị. Gaa n’ihu! Na-enweghị ịchụ àjà, anyị agaghị ebe ọ bụla! – dị ka ndụmọdụ ọnụ na-ekwuru ya, ya onwe ya kwa were nzọụkwụ abụọ gaa n’ihu, na-apụ n’anya na ndagwurugwu ahụ. Onye nwere obi ike sochiri ma onye ọ bụla ọzọ wee banye.
E nwere ịkwa ákwá, ịsụ ude, ịsụ ngọngọ, ịsụ ude na mkpọda nke nnukwu ọwa a. Mmadụ ga-a nu iyi na ọ nweghị onye ga-apụta ndụ, ma ọ bụrụ na ọ gaghị emerụ ahụ na otu, mana ndụ mmadụ siri ike. Onye ndu ahụ nwere ihu ọma pụrụ iche. Ọ kwụgidere n’ọhịa ka ọ dara ka ọ ghara imerụ ahụ. O jisiri ike dọpụta onwe ya wee rịpụ. Ka ọ na akwa arịrị, na asu ude na ịkwa akwa dara n’okpuru, ọ nọdụrụ ala na enweghị mmegharị, na agbachi nkịtị. Mmadụ ole na ole e tiri ihe na ndị iwe malitere ịkọcha ya mana ọ geghị ntị. Ndị ọ dabara nke ọma nwee ike ijidesi ohia ma ọ bụ osisi ike mgbe ha na-ada ada malitere ịgbalị ike ịgbago. Ụfọdụ gbawara isi ka ọbara na-agbapụta n’ihu ha. Ọ dịghị onye nọ n’otu akụkụ ma e wezụga onye ndu. Ha niile gbakụtara ya azụ ozugbo wee sụọ ude na mgbu mana ọ welighị isi ya elu. Ọ gbachiri nkịtị wee were ọnọdụ nke ezigbo onye amamihe!
Oge gafere. Ọnụ ọgụgụ ndị njem na-ebelata ma na-ebelata. Ụbọchị nke ọ bụla na-ama jijiji. Ụfọdụ hapụrụ ìgwè ahụ wee laghachi.
N’ime ọnụ ọgụgụ buru ibu nke malitere, ọ bụ naanị ihe dị ka iri abụọ fọdụrụ. Ihu ha, ike gwụchara na-egosipụta akara nke obi nkoropụ, obi abụọ, ike ọgwụgwụ na agụụ, mana onweghị onye kwuru ihe ọbụla. Ha dara jụụ dị ka onye isi ha wee na-agagharị. Ọbụna onye na-ekwuchitere mmụọ kpaliri isi ya nke ukwuu. Ụzọ ahụ siri ike n’ezie.
Ọnụ ọgụgụ ha belatara kwa ụbọchị ruo mgbe ọ dị naanị iri. N’ịbụ ndị ihu ha dara mbà, ha na-asụ ude ma na-eme mkpesa kama ịkparịta ụka. Ha dị ka ndị ngwọrọ karịa mmadụ. Ụfọdụ nọ n’ụkwụ. Ụfọdụ jidere aka ha n’èbè kegide n’olu ha. N’aka ha, e nwere ọtụtụ bandeeji na mkpakọ. Ọ bụrụgodị na ha chọrọ ịchụ àjà ọhụrụ, ha agaghị enwe ike n’ihi na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ nweghị ebe dị n’ahụ ha maka ọnya ọ bụla. Ọbụnadị ndị kacha sie ike na ndị nwere obi ike n’ime ha enwekwaghị okwukwe na olileanya mana ha ka na-agbasi mbọ ike karị; ya bụ, n’ụzọ ụfọdụ, ha na-agbasi mbọ ike, na-eme mkpesa, na-egbu mgbu. Kedu ihe ọzọ ha nwere ike ime ma ọ bụrụ na ha enweghị ike ịlaghachi? Ọtụtụ àjà na ugbu a ịhapụ njem ahụ?
Chi ojiji gbadara. Ka ha na-agbada na mkpara, ha hụrụ na mberede na onye ndu ahụ anoghị n’ihu ha ọzọ. Nzọụkwụ ọzọ na ha niile dabara na ndagwurugwu ọzọ.
– Ewo, ụkwụ m! Ewo, aka m! – mkpu arịrị na ịsụ ude. Otu olu na-adịghị ike kọchakwara onye ndu ruru eru mana ọ gbachi nkịtị.
Mgbe anyanwụ wara, onye ndu nọdụ ala, otu ihe ahụ n’ụbọchị ahụ mgbe ahọpụtara ya. Enweghị mgbanwe ọbụladị n’ọdịdị ya.
Onye nkwuchite ọnụ ahụ si na ndagwurugwu ahụ pụta, mmadụ abụọ ọzọ sochiri ya. N’ịbụ ndị nwere nkwarụ na ọbara, ha tụgharịrị wee hụ mmadụ ole fọdụrụ, mana ọ bụ naanị ha. Ụjọ ọnwụ na enweghị olileanya jupụtara n’obi ha. Amaghị mpaghara ahụ, ugwu, okwute – enweghị ụzọ ọ bụla. Ụbọchị abụọ tupu ha abịaruo n’okporo ụzọ mana ha hapụrụ ya.
Onye ndú ahu duru ha n’uzo ahu.
Ha chere echiche banyere ọtụtụ ndị enyi na ndị ikwu nwụrụ na njem a dị egwu. Mwute dị ike karịa ihe mgbu nke ụkwụ na nkwarụ ha meriri ha. Ha ji anya ha hụ mbibi nke ha.
Onye na-ekwuchitere ha ga kuru onye ndu wee malite iji olu ike gwụrụ juputara na mgbu, obi nkoropụ na obi ilu kwuo okwu.
– Ebee ka anyị na-aga ugbu a?
Onye ndu ahụ gbachiri nkịtị.
– Ebee ka ị na-akpọga anyị, oleekwa ebe ị kpọtara anyị? Anyị tinyere onwe anyị na ezinụlọ anyị n’aka gị ma anyị esoro gị, na-ahapụ ụlọ anyị na ili nna nna anyị na-enwe olileanya na anyị nwere ike ịzọpụta onwe anyị site na mbibi n’ala ahụ kpọrọ nkụ. E nwere narị ezinụlọ abụọ n’azụ gị ma ugbu a lee ole ha dị!
– Ị pụtara na onye ọ bụla anọghị ebe a? – onye ndú kwuru na nwayo na-enweghị welie isi ya.
– Kedu ka ị ga-esi jụọ ajụjụ dị otu a? Welie anya hụ! Gụo mmadụ ole n’ime anyị fọdụrụ na njem ọjọọ a! Lee ụdị anyị nọ na ya! Ọ ga-akara m mma ịnwụ karịa ka m nwee nkwarụ otu a.
– Enweghị m ike ịhụ gị!
– Gịnị mere?
Mgbachikiti nwuru anwu.
– Ị kwụsịrị ịhụ ụzọ gị n’oge njem?
– Amụrụ m na ìsì!
Mmadụ atọ ahụ kpuchiri isi ha na obi nkoropụ.
Ifufe mgbụsị akwụkwọ na-efegharị n’oké ugwu wee weda akwụkwọ kpọnwụrụ akpọnwụ. Anwụrụ ọkụ na-efegharị n’elu ugwu nta niile, nku ugolo na-efegharịkwa site n’ikuku oyi na-adịghị. Otu mkpọtụ na-adịghị mma dara ụda. Ezochiri anyanwụ n’azụ igwe ojii, nke na-efegharị ma na-aga n’ihu n’ihu.
Mmadụ atọ ahụ lere ibe ha anya n’oké egwu.
– Ebee ka anyị ga-aga ugbu a? – otu onye kwuru na nwayo.
– Anyị amaghị!
Na Belgrade, 1901.
Maka oru ngo “Radoje Domanović” onye nsụgharịrị bu Azodo Doyenne Ifeyinwa, 2021.
Ónyé ǹdú (2/3)

Na echi ya, onye ọbụla nwere obi ị ga njem dị anya gbakoro. Ihe karịrị ezinụlọ narị abụọ bịara n’ebe akwadobere. Nanị ụfọdụ ndị nọ n’ụlọ na elete ụlọ ochie.
Ọ bụ ihe nwute n’ezie, ele ọtụtụ ndị mmadụ na ahujuanya, ndị ịnụ ilu mere ka ha rapu ala amụrụ ha na ala eliri ndị nna ha ochie. Ịhụ ha juru eju, nkwochasie na gba ọkụ. Ahụhụ nke ogologo arọ gosiputara ihe ọ bu na arụ ha, ma na egosi nhụjuanya na obi di ilu nkoropu. Mana n’otu ntabi anya ahụ, ahụrụ m ntakịrị olileanya -agwakọtara ya na agụụ ụlọ iji jide n’aka.
Anya mmiri rudara na ịhụ ndi agadi ole ole, ndị mmasiri oso ike fufee isi ha ya na ikuku nke ajọ ihe. Ọ ka mma ka ha nọdụ ebe ahụ n’oge tere aka, ka ha onwe nwe nwụọ n’ime okwute ndia, karịa ma echobe ala ụlọ dị mma. Ọtụtụ ụmụnwaanyi kwara alili n’olu ike ma fere ndị nke ha nwụrụ anwụ aka, ndị ha na arapu ala ili ha.
Ụmụ nwoke na agba mbọ ka ha bụrụ ụzọ n’obi ike ma na eti mkpu, – Ọ dị mma, ị chọrọ ka unu ga n’ihu ikwu ọnụ agụụ n’ala emejoro na ebi na ọgwụ niile a? – N’eziokwu, ha gaara enwe mmasị kacha mma ka eburu mpaghara niile a bụrụ ọnụ na ebe ndị ogbenye nọ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume.
E nwere nkpọtu nkịtị na iti mkpu dịka n’ebe igwe mmadụ nọ. Ma nwoke ma nwaanyị ezighị ike. Ụmụaka nọ na-ebe akwa n’azụ nne ha. Odighikwa ma anu ulo nfe. Enweghị ọtụtụ ehi, nwa ehi ebe a ma ebe ahụ ma mgbe ahụ ịnyịnya tara ahu dị egwu, bu nnukwu isi na nnukwu ụkwụ nke ha na ebo nke ha na-ebukwasị akwa ochie, akpa na ọbụna akpa abụọ n’elu ihe e ji anọkọta ihe, nke mere na anụmanụ dara ogbenye na-efegharị n’okpuru ibu. Na agbaghi, ọ jisiri ike nwe nolite na ebe ákwá oge niile, ndị ọzọ na adoko ịbụ n’elu jàkí: ụmụaka jị iwe na akpụ nkita.
Ikwu okwu, iti mkpu, íbū ọnụ, eme mkpotu, íbē akwa, ígbō-ha niile jụrụ eju. Ma ịnyịnya nwuru ọnụ nwagbe nta. Mana onye ndu ekwughi ihe ọbụla, dịka aga asi na ihe niile a agbasịghị ya. Onye oke amamihe!
Ọnọdụ ala nwayọ dị egwu, kpudo isi n’ala. Ugbu na mgbe ahụ, na àbú ọnụ mmiri n’ala; nke a bu ihe niile. Mana echikota ọmụme iju anya ya, ma éwù ya na a gbago nke bu na onye ọ bụla ga aga ọkụ na mmiri mgbe ha na ekwuru ya. Mkparịta uka ndia ka enwere ike ịnụ:
– Anyị kwesiri enwe ọṅụ na anyị nwere ike ịchọta nwoke dị otu a. Anyị a ga enwe ike ị ga n’iru n’enweghi ya, Chukwu ekwela!
Anyị kara ila n’ihi. Ọ nwere ezigbo amamihe, a gwara m gi! Ọ na agba nkịtị. Ọ kwubeghi ihe ọ bụla ma oli!
– Otu onye kwuru dịka ọ na ele onye ndu anya na ùgwù na mpako.
– Gini ka ọ ga ekwu? Ọ bụla na ekwu ọtụtụ okwu anaghị eche ihe ọfụma. Nwoke ma ihe, ya bu eziokwu! Ọ nọ nani atughari uche ma okwughi ihe ọbụla, – otu onye tinyere na ele kwa onye ndu anya egwu.
– Ọ dịghị mfe ichi ọtụtụ mmadu! Ọ kwesiri ichokota echiche ya, maka na ọ nwetara nnukwu olu na aka ya, onye mbụ kwuru ọzọ. Oge rụrụ mgbe a ga ebido. Ha chere nwamgbe nta, na agbenyeghi, ka a ga ahụ onye ọbụla nwere ike igbanwe obi ị so ha, Ma ebe onweghị onye bịara ha enweghị ike iche ọzọ.
– Ọ na anyị ekwesighi ị ga ba? – ha jụrụ onye ndu.
Ọ biltere ọtọ na ekwughi ihe ọbụla.
Ụmụ nwoke obi sikarisiri ike, gbara ya okirikiri ozigbo, ka ha nọdụ nso maka ihe egwu ma ọbu ihe mberede.
Onye ndu, gbaruru, nwedaa isi ya n’ala, zọpụ nzọụkwụ ole na ole, na efehari osisi ya n’iru ya n’uzo di ùgwù. Ọgbakọ soo ya na-aga n’azu ya tie mkpụ ọtụtụ mgbe, “Onye ndu anyị na adị ndu ebieghi ebi!” Ọ weere nzọụkwụ ole na ole ọzọ wee daba na mgbidi n’ihu ụlọ ezumezu obodo ahu.
N’ebe ahụ, dị ka ọ kwesịrị, ọ kwụsịrị; ya mere otu ahụ kwụsịkwara. Onye ndu ahụ wee laghachi azụ ntakịrị wee kuo osisi ya na mgbidi ọtụtụ oge.
– Gini ka i chọrọ ka anyi mee? – ha jụrụ.
Ọ kwughi ihe ọbụla.
– Gini ka anyi ga emezi? Butue mgbidi a ala! Nke a bu ihe anyị ga-eme! Ị hughi na ọ jị osisi ya egosi anyị ihe anyị ga-eme? – ndi nọ onye ndu nso tịrị.
– Ebe ahụ ka ọnụ ụzọ dị! ebe ahụ ka ọnụ ụzọ dị! – ụmụaka tiri rụkwa aka na ọnụ ụzọ nke chere ha ịrụ.
– Heh! Nwayọ, umuaka!
– Chukwu nyere anyi aka, gini na-eme? – ụmụnwaanyi ole na ole gafere onwe ha.
– Ọ nweghị okwu ọbụla! Ọ mara ihe ọ ga-eme. Butue mgbidi ala!
Ozigbo, mgbidi a rụrụ ala dịka aga asi na odibughi ebe ahụ mbụ.
Ha gara gafe mgbidi.
Ọ dịtụghị mgbe ha gara otu narị nzọ ụkwụ mgbe onye ndu ahụ gbabara n’ime nnukwu ohia ọgwụ wee kwụsị. N’oké ihe isi ike, o jisiri ike dọpụta onwe ya wee malịte ikutu osisi ya n’akụkụ niile. Ọ dịghị onye jụrụ.
– Gini na eme ugbu a? – ndi nọ n’azu tịrị.
– Gbupu ohia ogwu! – ka ndị kwadebere onye ndu tịrị.
– E nwere ụzọ n’azu ohia ọgwụ! Ebe ahụ ka ọ dị! – ụmụaka tịrị ma ọtụtụ ndị nọ n’azu
– Ebe ahụ ka ụzọ! Ebe ahụ ka ụzọ! – ndi nọ nso onye ndu dị njikere, ha jị iwe nwe kwuo. – Ma kedu ka anyị ụmụ nwoke kpuruisi ga esi ma ebe ọ du anyi aga? Onye ọbụla agaghị enye iwu. Onye ndu mara nke ka mma na ụzọ nke kasi mma. Butue ohia ọgwụ!
Ha mikpuru n’ime iji dozie ụzọ.
– Ohuu, – ka onye ọgwụ duru n’aka tịrị ya na onye ọzọ nke tiri irụ na alaka osisi ogwu.
– Ụmụnnam, enweghị ike enwete ihe na efu. Ị ga ata onwe gị ahụhụ obele ka ị nwe nwete, – onye kachasi ike n’otu zara.
Ha gafere ohia mgbe ha gbasiri mbo ike nwe gafere n’ihu.
Ka ha gaharasiri nwamgbe nta, ha bịara na ọgwụ. Nke a kwa, a kwaturu ya. Mgbe ahụ, ha gara n’ihu.
Nani obere ebe ka ha garuru na ubochi mbụ maka na ha ekwesiri emeri ọtụtụ ihe mgbochi yiri ya. Na ihe niile, na obere nri n’ihi na ụfọdụ nwetere nanị achịcha kpọrọ nkụ na obele achịcha ekoghi eko, ebe ndị ọzọ nwere achịcha eji mgbo agụụ ha. Ụfọdụ enweghị ihe ọbụla ma oli.
Ọ dabara na ọ bụ oge ọkọchị ka ha wee chọta osisi mkpụrụ ebe a na ebe ahụ.
Otu a, n’ihi na ụbọchị nke mbụ obere ezumuike ka ha nwere, ike gwuru ha. Enweghị ihe egwu pụtara bu, enweghikwa ihe mmeru ahu putarakwara ma ncha. Dị ka ọ kwesịrị, na nnukwu ọrụ dị otú ahụ, a ga-atụle ihe ndị na-adịghị mkpa: ogwI nke rapaara na anya aka ekpe nke otu nwanyị, nke ọ jiri ákwà di mmiri kpuchie; otu nwatakịrị kụrụ ụkwụ ya n’ogbe osisi, ọ wee daa ma mee mkpatụ; otu agadi nwoke kụgburu ụkwụ n’ọhịa ogwu wee kụọchafu nkwonkwo ụkwụ ya; mgbe etinyesiri ya yabasị akworo akwo, nwoke ahụ jị obi ike die ihe mgbu ahụ, dabere na osisi ya, jiri ụkwụ na-aga n’ihu n’azụ onye ndu. (N’ikwu eziokwu, ọtụtụ mmadụ kwuru na agadi nwoke ahụ na-agha ụgha maka nkwonkwo ụkwụ, na ọ na-eme ka ọ na-eme n’ezie n’ihi na ọ na-achọsi ike ịlaghachi.) N’oge adighi anya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-enweghị ogwu n’ogwe aka ha ma ọ bụ ihu nkukosi. Ndị nwoke tachiri obi ya niile ebe ụmụnwanyi na-akọcha oge awa ha hapụrụ ma ụmụaka na-ebe akwa, dịka ọ dị, n’ihi na ha aghọtaghị ọrụ a niile na ihe mgbu ga-akwụghachi ụgwọ nke ukwuu.
Ọtụtụ ihe na-enye mmadụ niile obi ụtọ na onu, onweghị ihe na eme onye ndu. N’ikwu eziokwu, ọ bụrụ na anyị ga-ekwu eziokwu,o bu onye nwere ezi nchekwa nke oma, mana n’agbanyeghị nke ahụ, nwoke ahụ nwere ihu ọma. N’abalị mbụ n’ebe ha no onye ọ bụla kpere ekpere ma kelee Chineke na njem ụbọchị ahụ gara nke ọma na ọ nweghị ihe ọ bụla, ọbụlagodi ntakịrị ọdachi a dakwasịrị onye ndu ahụ.
Mgbe ahụ otu nwoke n’ime ndị ụjọ anaghị atụ, malịtere ikwu. Osisi ogwu kpụchapụrụ ihu ya, mana ọnaghi ya anya ma oli.
– Ụmụnna m, – ọ malite. – Njem otu ụbọchị gara nke oma n’azu, ekele Dori Chineke. Ụzọ ahụ adịghị mfe, mana anyị kwesịrị ịtachi obi n’ihi na anyị niile maara na ụzọ a siri ike ga-eduga anyị na obi ụtọ.
Ka Chukwu Pụrụ Ime Ihe Niile chebe onye ndu anyị pụọ na mmerụ ahụ ọ bụla ka ọ nwee ike gaa n’ihu na-edu anyị nke ọma.
– Echi m ga-atụfu anya m nke ọzọ ma ọ bụrụ na ihe dị kwa ka o do taa! – otu n’ime ụmụ nwanyị kwuru n’iwe.
– Ee, ụkwụ m! – agadi nwoke ahụ bere, okwu nwanyị ahụ gbara ya ume.
Ụmụaka nọ na-ebe akwa, ọ na-esikwara ndị nne ike imechi ha ọnụ ka a wee nụ onye na-ekwuchitere ha.
– Ee, ị ga-atụfu anya gị nke ọzọ, – ọ malitere n’iwe, – ị nwere ike tufuo ha abụọ! Ọ bụghị nnukwu ihe ọghọm maka otu nwanyị ịhapụ anya ya maka nnukwu ihe kpatara ya. Ihere kwesịrị ime gị. Ọ dịtụghị mgbe ị na-eche maka ọdịmma ụmụ gị? Ka ọkara n’ime anyị laaniyi na nnukwu mbọ a! Kedu ihe dị iche ọ na-eme? Kedu ihe bu otu anya? Kedu uru anya gị bara mgbe enwere onye na-achọ anyị na-eduga anyị na-enwe obi ụtọ? Anyị a ga-ahapụ ọrụ anyị naanị n’ihi anya gị na ụkwụ agadi nwoke a?
– Ọ na-agha ụgha! Okenye ya na-agha ụgha! Ọ na-eme onwe ya naanị ka ọ nwee ike ịlaghachi, – olu dara ụda n’akụkụ niile.
– Ụmụnna m, onye ọ bụla na-achọghị ịga n’ihu, – onye ọnụ na-ekwuchitere kwuru ọzọ, – hapụ ya ka ọ laa kama ime mkpesa ma kpalie anyị ndị ọzọ. N’ihe gbasara m, aga m eso onye ndu a maara ihe ma ọ bụrụ haala na enwere ihe fọdụrụ n’ime m!
– Anyị niile ga-eso! Anyị niile ga-eso ya ma ọ bụrụhaala na anyị dị ndụ!
Onye ndu ahụ gbachiri nkịtị.
Onye ọ bụla malitere ile ya anya wee na-atakwụnyere ya, sị:
– Ọ na-echebara ya echiche!
– Nwoke maara ihe!
– Lee n’egedege ihu ya!
– Na ị na-agbaro ihu mgbe niile!
– Ọdịdị!
– Ọ mara ihe! A na-ahụ nke ahụ n’ihe niile gbasara ya.
– Ị nwere ike ikwu ya ọzọ! Mgbidi, agha, – ọ na-akọcha ya niile. Ọ na-eji osisi ya na-akụ n’ala, n’ekwughị ihe ọ bụla, ị ga-echerịrị ihe obu n’uche.
Ónyé ǹdú (1/3)

– Ụmụnnam na ndị enyim, a nuwom ihe niile unu kwụrụ, ya mere m ji a sị unu gee m ntị. Ihe niile na mkparịta ụka niile anyị kwụrụ, onweghị nke zụrụ oke ma anyị nogidisie ike n’ala nadịghị ámị̀ mkpụrụ. N’ala ájá mkpụrụ na okwute ọ dịghị ihe ọ bụla na-epu na ya, na agbanyeghị mgbe mmiri na-ezo, na agbanyeghị oge mmiri niile mịkọsịrị nke onye ọ bụla na ahutubeghi. Rue ole mgbe ka anyị ga ezukọtakwa ọnụ otua nwee mkparịta n’efu? Igwe ehi n’anwu, oge na adịghị anya agụụ ga-ebido gụba anyị na ụmụ anyị. Anyị ga achọtarịrị otu ọ̀zọ́ dị mma, ga aba uru. A nam eche na anyị ga arapụ ala a na-adịghị eme ihe ga n’uwa chọta ala dị mma nke ga eme ka mkpụrụ mịe, n’ihi na anyị agaghị anogịde otu a.
Ya mere, onye bi ebe ala na dịghị eme nri kwuru okwu otu mgbe na ike ọgwụgwụ na ọgbakọ ụfọdụ. Ebe ma ọbu mgbe ọ mere, ọ gbasaghị mụ na gị, a nam eche. Ọ dị mkpa na Ịgba ga ekwenyere m na ihe mere n’ala ụfọdụ n’oge gara aga, ya bụ na nke a ezuwo. N’otu oge na ekwu eziokwu, echerem na ọ bụ mụ bụ ihe mebere akụkọ a, e jim nwayọ nwayọ nwepu onwem na akụkọ a na abeghị uru. Ekweghịm ike ugbu na aga m akọwaputasị ihe mere na nke mere ebe ọ̀zọ́ na otu oge gara aga, ihe na enweghị ike ịkọwaputa.
Ndi na-egentị, jị ike ọgwụgwụ na gbarụ iru na enweghị olileanya, gbanyere aka n’ukwu, na olileanya dị n’okwu amamihe a. Onye ọ bụla nọworị na-eche n’echiche na ọ nọ n’ụdị anwansi, ala paradaịs ebe ụgwọ ọrụ nke ịla azụ ga-abụ nnukwu ihe ubi.
– Ọ kwuru eziokwu! Ọ kwuru eziokwu! – ọtamuru na akụkụ niile.
– Ebe ọ dị ns…o…? – a nụrụ ntamu na-adọkpụ site n’akụkụ.
– Ụmụnam!, – ọ̀zọ́ malịtere n’olu dị ike. – Anyị ga eso ndụmọdụ ozigbo, n’ihi na anyị ama sị otu a ga ọ̀zọ́. Anyị adọgbuola onwe anyị n’ọrụ na setikwa onwe anyị, mana ihe niile bụ ihe efu. Anyị ekola mkpụrụ anyi kwesịrị ejiri mere nri, ma idei mmiri bịara wee sacha mkpụrụ na ala site na mkpọda nke mere na ọ bụ nanị nkume efu fọdụrụ. Anyị a ga anogịde ebe ruo mgbe ebighi ebi na-arụ ọrụ, ụtụtụ na abali na inogide na agụụ na akpịrị ịkpo nkụ, ị́gbá ọ̀tọ́ na ị́gbá ụkwụ ọ̀tọ́? Anyị na ebili ịpụta ka anyi chọọ ebe ka mma na ala na eme nri ebe ịrụsi ọrụ ike ga amịpụta ọtụtụ mkpụrụ.
– Anyị apụọ! Ka anyị pụọ ugbu a, n’ihi na ebe adịghị mma obibi ọ̀zọ́!
Ntamu malịtere, onye ọbụla malịtere ịpụrụ onwe ya, na echeghị ebe ọ n’aga. Agbasịghị ike, anyị nwe ike ijedebe ebe ka njọ karịa ịzọpụta onwe anyị. A nam atunye aro ka anyị rọpụta onye ndu, nke anyị ga erubere isi, onye ga ezi anyị ihe ka mma na ụzọ kwuọtọ.
– Ka anyị ghọta! Ka anyi ghọta mmadu ugbu a, – nke anuru ebe niile.
Nanị ugbu a ka ndọrọ ndọrọ malịtere, ezigbo ọgba aghara.
Onye ọ bụla na ekwu okwu ma onweghị onye nwe ike ịgentị ma ọbu ịnụ ihe. Ha malịte ịkọwa onwe ha n’otu dị iche iche, ọ bụla na-ekwuru onwe ya, mgbe ahụ ọbuna otu otu ahụ kebiwe onwe ha. Na abụọ abụọ, ha malịtere ịkwu okwu site na ogwe aka, na-akparịta ụka, na-anwa igosipụta ihe, na-adọta ibe ha site na aka uwe, ma jiri aka ha na-agbachi nkịtị. Ha zukọtara ọnụ ọ̀zọ́, ma na ekwu kwa okwu.
– Ụmụnam! – otu olu dara ụda tiri mkpu na oke olu, nke mere na ọ mechiri olu ndị ọ̀zọ́ na enweghị ume. – Anyị agaghị ekwete otu ihe otu a. Onye ọ bụla na ekwu okwu, ma onweghị onye na egentị. Ka anyị ghọta onye ndu! Onye n’ime anyị ka anyị ga aghọta? Onye n’ime anyị ga goro njem nke oma, ị mata ụzọ? Anyị mara onwe anyị ọfụma, ya mere mụ onwem agaghị etinye onwe m ma ọbu ụmụ na okpuru ọchịchị onye ọbụla nọ ebe a. Kama, gwam onye njem ahụ nnọọ ebe ahụ, nke nnọri na ndo na okporo ụzọ kemgbe ụtụtụ?
Dara jụụ. Ha niile tụgharịrị n’ebe onye ọbịa nọ, nwe tule ya bido n’isi ruo n’mkpịsị ụkwụ.
Onye njem, agbata nwata na okenye, nwere ihu na-adịghị ahụkebe nke a na-adịghị ahụkebe n’ihi ajị agba ya na ogologo ntutu isi ya, nọdụ ala wee nọrọ jụụ dị ka ọ dị na mbụ, tinye uche n’echiche, wee kụọ nnukwu okpiri ya n’ala site n’oge ruo n’oge.
Ụnyaahụ, a hurum nwoke ahụ na obele nwakorobia. Ha jidere onwe ha n’aka nwee na-agbada n’ogbe. Na abali gara aga, nwata nwoke hapụrụ ogbe ahụ mana onye ọbịa nọ ebe a.
Nwa nna,ka anyị chefuo ihe nzuzu ndị a ka anyị ghara igbu oge ọ bụla. Onye ọ bụla ọ bụ, o si ebe dị anya bịa ebe ọ bụ na ọ nweghị onye n’ime anyị maara ya, ọ makwa n’ezie ụzọ kacha mkpụmkpụ na ụzọ kacha mma isi duru anyị. Ọ bụ ikpe na ọ bụ onye mara ihe, maka ọ nọ ebe ahụ nwayọ na echekwa echiche. Onye ọ bụla ọzọ ga-etinyeworị ihe omume anyị ugboro iri ma ọ bụ karịa ka ọ dị ugbu a ma ọ bụ malịte mkparịta ụka na otu n’ime anyị, kama ọ na anogịde ebe ahụ oge niile na onwe ya na akwụghị ihe ọbụla.
– N’ezie, nwoke a n’ano nwayọ maka na ọ nwere ihe ọ na-eche, ọ nwere ike ị bụ ihe ọzọ beluso na o maara oke ihe, – Ndi ọzọ kwetere, nwe malịte inyocha onye obia ọzọ. Onye ọbụla achoputawo ihe amamihe dị n’ime ya, ngosi ihe pụtara na amamihe ya.
Na egbughị ọtụtụ oge na ekwu okwu, na ikpeazu ha niile kwenyere na o ga aka mma ka ajuo onye ọbịa a.
Onye, ọ dị ha ka Chineke zitere ka o duputa n’ime uwa ka ha chọọ ogige na ala na eme ihe. Ọ ga abụ onye ndu ha, ma ha ga ege ya ntị na erubere ya isi na abụghị ajụjụ.
Ha ghọtara mmadụ iri n’ime onwe, ndị ga-ejekwuru onye ọbịa kowara ya ihe ha kpebiri. Nroputa a bu e jị ngosi ajọ ọnọdụ ha ma rio ya ka ọ bụrụ onye ndu ha.
Ya mere mmadu iri ahụ nwe ga kpọ isi ala n’obi ume ala. Otu onye n’ime ha, malịtere kwube maka ala na adịghị emeputa ihe, maka aro kpọrọ nkụ na kwa ihe ọjọọ nke ha niile hutara onwe ha n’ime ya. Ọ kwụsịrị na usoro ndị a:
– Ọnọdụ ndị a mere ka anyị hapụ ụlọ anyị na ala anyị nwe pụọ n’ime ụwa ka anyị chọta ala ụlọ ebe ka mma. N’oge a, mgbe anyị mmesia kwekorita, o dizia ka Chineke nwere ebere na-ebe anyị nọ, na ọ zitere anyị gị – gị, onye amamihe na onye ọbịa ziri ezi. Na ị ga edu anyị ma napụta ya na nhusianya anyi. N’aha ndị niile bi n’ebe a, anyị riorio ka ị bụrụ onye ndu anyị. Ebe ọ bụla ị ga aga, anyị ga-eso. Ị mara ụzọ niile, n’ezie amuyere gị n’ọṅụ na ala ụlọ dị mma. Anyị ga-ege gị ntị, rube isi na iwu gị ọ bụla. Ị ga, onye ọbịa mara ihe ekwe ka ịzọputa ọtụtụ mkpụrụ obi na mbibi? Ị ga abu onye ndu anyị?
N’oge niile ọ na-ekwu okwu a, onye bịara abịa maara ihe anaghị ebuli isi ya elu. Oge niile ọ nọ na otu ọnọdụ ha hụrụ ya, ọ nwe dara isi ya, ọ gbaroro ịhụ ma ọ kwughi ihe ọbụla. Soo ihe ọ mere bu iku osisi ya n’ala n’oge niile-na eche. Mgbe e kwụsịrị okwu, ọ na -atụgharị nwayọ nwayọ na-agbanweghị ọnọdụ ya:
– Ekwem!
– Anyị aga eso gị ga chọta ebe ka mma?
– Ị nwere ike! – ọ malitekwa na enweliteghi isi elu. Mmalite ịnụ ọkụ n’obi na ngosipụta nke ekele bilitere ugbu a, mana onye ọbịa agwaghị onye ọ bụla okwu.
Mmadu iri ahụ gwara ndị ọzọ gbakoro ihe ha jetara, ha tinyere na ugbua ka ọ hutara ihe oke amamihe nwoke a nwere.
Ọ meghirighi arụ ma ọ bu nweligodi isi ị hụ onye na-agwa okwu, ọnọdụ nwayọ na etughari uche. N’okwu anyị niile na ekele, ọ kwuru nanị mkpuru okwu anọ.
– Ezi onye amamihe! Ọgugu isi dị uko!
– Ha jị ọṅụ tie oke mkpu na akụkụ niile, na ekwunye na Chineke na onwe ya zitere ya dịka muo ozi si n’eluigwe bịa ịzọputa ya.
Ha niile kwenyesiri ike na oganiru ha na okpuru onye ndu a, nke ọ na enweghi ihe n’ụwa ga gbagoju anya. Na otu aka ahụ, ha kpebiri ka ha belie echi mgbe chi boro.