Ónyé ǹdú (2/3)

Na echi ya, onye ọbụla nwere obi ị ga njem dị anya gbakoro. Ihe karịrị ezinụlọ narị abụọ bịara n’ebe akwadobere. Nanị ụfọdụ ndị nọ n’ụlọ na elete ụlọ ochie.
Ọ bụ ihe nwute n’ezie, ele ọtụtụ ndị mmadụ na ahujuanya, ndị ịnụ ilu mere ka ha rapu ala amụrụ ha na ala eliri ndị nna ha ochie. Ịhụ ha juru eju, nkwochasie na gba ọkụ. Ahụhụ nke ogologo arọ gosiputara ihe ọ bu na arụ ha, ma na egosi nhụjuanya na obi di ilu nkoropu. Mana n’otu ntabi anya ahụ, ahụrụ m ntakịrị olileanya -agwakọtara ya na agụụ ụlọ iji jide n’aka.
Anya mmiri rudara na ịhụ ndi agadi ole ole, ndị mmasiri oso ike fufee isi ha ya na ikuku nke ajọ ihe. Ọ ka mma ka ha nọdụ ebe ahụ n’oge tere aka, ka ha onwe nwe nwụọ n’ime okwute ndia, karịa ma echobe ala ụlọ dị mma. Ọtụtụ ụmụnwaanyi kwara alili n’olu ike ma fere ndị nke ha nwụrụ anwụ aka, ndị ha na arapu ala ili ha.
Ụmụ nwoke na agba mbọ ka ha bụrụ ụzọ n’obi ike ma na eti mkpu, – Ọ dị mma, ị chọrọ ka unu ga n’ihu ikwu ọnụ agụụ n’ala emejoro na ebi na ọgwụ niile a? – N’eziokwu, ha gaara enwe mmasị kacha mma ka eburu mpaghara niile a bụrụ ọnụ na ebe ndị ogbenye nọ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume.
E nwere nkpọtu nkịtị na iti mkpu dịka n’ebe igwe mmadụ nọ. Ma nwoke ma nwaanyị ezighị ike. Ụmụaka nọ na-ebe akwa n’azụ nne ha. Odighikwa ma anu ulo nfe. Enweghị ọtụtụ ehi, nwa ehi ebe a ma ebe ahụ ma mgbe ahụ ịnyịnya tara ahu dị egwu, bu nnukwu isi na nnukwu ụkwụ nke ha na ebo nke ha na-ebukwasị akwa ochie, akpa na ọbụna akpa abụọ n’elu ihe e ji anọkọta ihe, nke mere na anụmanụ dara ogbenye na-efegharị n’okpuru ibu. Na agbaghi, ọ jisiri ike nwe nolite na ebe ákwá oge niile, ndị ọzọ na adoko ịbụ n’elu jàkí: ụmụaka jị iwe na akpụ nkita.
Ikwu okwu, iti mkpu, íbū ọnụ, eme mkpotu, íbē akwa, ígbō-ha niile jụrụ eju. Ma ịnyịnya nwuru ọnụ nwagbe nta. Mana onye ndu ekwughi ihe ọbụla, dịka aga asi na ihe niile a agbasịghị ya. Onye oke amamihe!
Ọnọdụ ala nwayọ dị egwu, kpudo isi n’ala. Ugbu na mgbe ahụ, na àbú ọnụ mmiri n’ala; nke a bu ihe niile. Mana echikota ọmụme iju anya ya, ma éwù ya na a gbago nke bu na onye ọ bụla ga aga ọkụ na mmiri mgbe ha na ekwuru ya. Mkparịta uka ndia ka enwere ike ịnụ:
– Anyị kwesiri enwe ọṅụ na anyị nwere ike ịchọta nwoke dị otu a. Anyị a ga enwe ike ị ga n’iru n’enweghi ya, Chukwu ekwela!
Anyị kara ila n’ihi. Ọ nwere ezigbo amamihe, a gwara m gi! Ọ na agba nkịtị. Ọ kwubeghi ihe ọ bụla ma oli!
– Otu onye kwuru dịka ọ na ele onye ndu anya na ùgwù na mpako.
– Gini ka ọ ga ekwu? Ọ bụla na ekwu ọtụtụ okwu anaghị eche ihe ọfụma. Nwoke ma ihe, ya bu eziokwu! Ọ nọ nani atughari uche ma okwughi ihe ọbụla, – otu onye tinyere na ele kwa onye ndu anya egwu.
– Ọ dịghị mfe ichi ọtụtụ mmadu! Ọ kwesiri ichokota echiche ya, maka na ọ nwetara nnukwu olu na aka ya, onye mbụ kwuru ọzọ. Oge rụrụ mgbe a ga ebido. Ha chere nwamgbe nta, na agbenyeghi, ka a ga ahụ onye ọbụla nwere ike igbanwe obi ị so ha, Ma ebe onweghị onye bịara ha enweghị ike iche ọzọ.
– Ọ na anyị ekwesighi ị ga ba? – ha jụrụ onye ndu.
Ọ biltere ọtọ na ekwughi ihe ọbụla.
Ụmụ nwoke obi sikarisiri ike, gbara ya okirikiri ozigbo, ka ha nọdụ nso maka ihe egwu ma ọbu ihe mberede.
Onye ndu, gbaruru, nwedaa isi ya n’ala, zọpụ nzọụkwụ ole na ole, na efehari osisi ya n’iru ya n’uzo di ùgwù. Ọgbakọ soo ya na-aga n’azu ya tie mkpụ ọtụtụ mgbe, “Onye ndu anyị na adị ndu ebieghi ebi!” Ọ weere nzọụkwụ ole na ole ọzọ wee daba na mgbidi n’ihu ụlọ ezumezu obodo ahu.
N’ebe ahụ, dị ka ọ kwesịrị, ọ kwụsịrị; ya mere otu ahụ kwụsịkwara. Onye ndu ahụ wee laghachi azụ ntakịrị wee kuo osisi ya na mgbidi ọtụtụ oge.
– Gini ka i chọrọ ka anyi mee? – ha jụrụ.
Ọ kwughi ihe ọbụla.
– Gini ka anyi ga emezi? Butue mgbidi a ala! Nke a bu ihe anyị ga-eme! Ị hughi na ọ jị osisi ya egosi anyị ihe anyị ga-eme? – ndi nọ onye ndu nso tịrị.
– Ebe ahụ ka ọnụ ụzọ dị! ebe ahụ ka ọnụ ụzọ dị! – ụmụaka tiri rụkwa aka na ọnụ ụzọ nke chere ha ịrụ.
– Heh! Nwayọ, umuaka!
– Chukwu nyere anyi aka, gini na-eme? – ụmụnwaanyi ole na ole gafere onwe ha.
– Ọ nweghị okwu ọbụla! Ọ mara ihe ọ ga-eme. Butue mgbidi ala!
Ozigbo, mgbidi a rụrụ ala dịka aga asi na odibughi ebe ahụ mbụ.
Ha gara gafe mgbidi.
Ọ dịtụghị mgbe ha gara otu narị nzọ ụkwụ mgbe onye ndu ahụ gbabara n’ime nnukwu ohia ọgwụ wee kwụsị. N’oké ihe isi ike, o jisiri ike dọpụta onwe ya wee malịte ikutu osisi ya n’akụkụ niile. Ọ dịghị onye jụrụ.
– Gini na eme ugbu a? – ndi nọ n’azu tịrị.
– Gbupu ohia ogwu! – ka ndị kwadebere onye ndu tịrị.
– E nwere ụzọ n’azu ohia ọgwụ! Ebe ahụ ka ọ dị! – ụmụaka tịrị ma ọtụtụ ndị nọ n’azu
– Ebe ahụ ka ụzọ! Ebe ahụ ka ụzọ! – ndi nọ nso onye ndu dị njikere, ha jị iwe nwe kwuo. – Ma kedu ka anyị ụmụ nwoke kpuruisi ga esi ma ebe ọ du anyi aga? Onye ọbụla agaghị enye iwu. Onye ndu mara nke ka mma na ụzọ nke kasi mma. Butue ohia ọgwụ!
Ha mikpuru n’ime iji dozie ụzọ.
– Ohuu, – ka onye ọgwụ duru n’aka tịrị ya na onye ọzọ nke tiri irụ na alaka osisi ogwu.
– Ụmụnnam, enweghị ike enwete ihe na efu. Ị ga ata onwe gị ahụhụ obele ka ị nwe nwete, – onye kachasi ike n’otu zara.
Ha gafere ohia mgbe ha gbasiri mbo ike nwe gafere n’ihu.
Ka ha gaharasiri nwamgbe nta, ha bịara na ọgwụ. Nke a kwa, a kwaturu ya. Mgbe ahụ, ha gara n’ihu.
Nani obere ebe ka ha garuru na ubochi mbụ maka na ha ekwesiri emeri ọtụtụ ihe mgbochi yiri ya. Na ihe niile, na obere nri n’ihi na ụfọdụ nwetere nanị achịcha kpọrọ nkụ na obele achịcha ekoghi eko, ebe ndị ọzọ nwere achịcha eji mgbo agụụ ha. Ụfọdụ enweghị ihe ọbụla ma oli.
Ọ dabara na ọ bụ oge ọkọchị ka ha wee chọta osisi mkpụrụ ebe a na ebe ahụ.
Otu a, n’ihi na ụbọchị nke mbụ obere ezumuike ka ha nwere, ike gwuru ha. Enweghị ihe egwu pụtara bu, enweghikwa ihe mmeru ahu putarakwara ma ncha. Dị ka ọ kwesịrị, na nnukwu ọrụ dị otú ahụ, a ga-atụle ihe ndị na-adịghị mkpa: ogwI nke rapaara na anya aka ekpe nke otu nwanyị, nke ọ jiri ákwà di mmiri kpuchie; otu nwatakịrị kụrụ ụkwụ ya n’ogbe osisi, ọ wee daa ma mee mkpatụ; otu agadi nwoke kụgburu ụkwụ n’ọhịa ogwu wee kụọchafu nkwonkwo ụkwụ ya; mgbe etinyesiri ya yabasị akworo akwo, nwoke ahụ jị obi ike die ihe mgbu ahụ, dabere na osisi ya, jiri ụkwụ na-aga n’ihu n’azụ onye ndu. (N’ikwu eziokwu, ọtụtụ mmadụ kwuru na agadi nwoke ahụ na-agha ụgha maka nkwonkwo ụkwụ, na ọ na-eme ka ọ na-eme n’ezie n’ihi na ọ na-achọsi ike ịlaghachi.) N’oge adighi anya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-enweghị ogwu n’ogwe aka ha ma ọ bụ ihu nkukosi. Ndị nwoke tachiri obi ya niile ebe ụmụnwanyi na-akọcha oge awa ha hapụrụ ma ụmụaka na-ebe akwa, dịka ọ dị, n’ihi na ha aghọtaghị ọrụ a niile na ihe mgbu ga-akwụghachi ụgwọ nke ukwuu.
Ọtụtụ ihe na-enye mmadụ niile obi ụtọ na onu, onweghị ihe na eme onye ndu. N’ikwu eziokwu, ọ bụrụ na anyị ga-ekwu eziokwu,o bu onye nwere ezi nchekwa nke oma, mana n’agbanyeghị nke ahụ, nwoke ahụ nwere ihu ọma. N’abalị mbụ n’ebe ha no onye ọ bụla kpere ekpere ma kelee Chineke na njem ụbọchị ahụ gara nke ọma na ọ nweghị ihe ọ bụla, ọbụlagodi ntakịrị ọdachi a dakwasịrị onye ndu ahụ.
Mgbe ahụ otu nwoke n’ime ndị ụjọ anaghị atụ, malịtere ikwu. Osisi ogwu kpụchapụrụ ihu ya, mana ọnaghi ya anya ma oli.
– Ụmụnna m, – ọ malite. – Njem otu ụbọchị gara nke oma n’azu, ekele Dori Chineke. Ụzọ ahụ adịghị mfe, mana anyị kwesịrị ịtachi obi n’ihi na anyị niile maara na ụzọ a siri ike ga-eduga anyị na obi ụtọ.
Ka Chukwu Pụrụ Ime Ihe Niile chebe onye ndu anyị pụọ na mmerụ ahụ ọ bụla ka ọ nwee ike gaa n’ihu na-edu anyị nke ọma.
– Echi m ga-atụfu anya m nke ọzọ ma ọ bụrụ na ihe dị kwa ka o do taa! – otu n’ime ụmụ nwanyị kwuru n’iwe.
– Ee, ụkwụ m! – agadi nwoke ahụ bere, okwu nwanyị ahụ gbara ya ume.
Ụmụaka nọ na-ebe akwa, ọ na-esikwara ndị nne ike imechi ha ọnụ ka a wee nụ onye na-ekwuchitere ha.
– Ee, ị ga-atụfu anya gị nke ọzọ, – ọ malitere n’iwe, – ị nwere ike tufuo ha abụọ! Ọ bụghị nnukwu ihe ọghọm maka otu nwanyị ịhapụ anya ya maka nnukwu ihe kpatara ya. Ihere kwesịrị ime gị. Ọ dịtụghị mgbe ị na-eche maka ọdịmma ụmụ gị? Ka ọkara n’ime anyị laaniyi na nnukwu mbọ a! Kedu ihe dị iche ọ na-eme? Kedu ihe bu otu anya? Kedu uru anya gị bara mgbe enwere onye na-achọ anyị na-eduga anyị na-enwe obi ụtọ? Anyị a ga-ahapụ ọrụ anyị naanị n’ihi anya gị na ụkwụ agadi nwoke a?
– Ọ na-agha ụgha! Okenye ya na-agha ụgha! Ọ na-eme onwe ya naanị ka ọ nwee ike ịlaghachi, – olu dara ụda n’akụkụ niile.
– Ụmụnna m, onye ọ bụla na-achọghị ịga n’ihu, – onye ọnụ na-ekwuchitere kwuru ọzọ, – hapụ ya ka ọ laa kama ime mkpesa ma kpalie anyị ndị ọzọ. N’ihe gbasara m, aga m eso onye ndu a maara ihe ma ọ bụrụ haala na enwere ihe fọdụrụ n’ime m!
– Anyị niile ga-eso! Anyị niile ga-eso ya ma ọ bụrụhaala na anyị dị ndụ!
Onye ndu ahụ gbachiri nkịtị.
Onye ọ bụla malitere ile ya anya wee na-atakwụnyere ya, sị:
– Ọ na-echebara ya echiche!
– Nwoke maara ihe!
– Lee n’egedege ihu ya!
– Na ị na-agbaro ihu mgbe niile!
– Ọdịdị!
– Ọ mara ihe! A na-ahụ nke ahụ n’ihe niile gbasara ya.
– Ị nwere ike ikwu ya ọzọ! Mgbidi, agha, – ọ na-akọcha ya niile. Ọ na-eji osisi ya na-akụ n’ala, n’ekwughị ihe ọ bụla, ị ga-echerịrị ihe obu n’uche.